Gịnị bu korona? Gịnị ka m ga-eme maka ya?

Korona ma ọ bụ Koronavaịrọs bụ nje dị ntakịrị nke ukwuu na anya na ekpughị ihe e ji ahụ ihe dị ntakịrị otu ahụ a pụghị ihụ ya, mana ọ na-gbasa, na-ebutekwara ndị mmadụ ọrịa. Ihe ndị ga-emebe mmadụ, a sị na ọ dịkwa ka ọ bụ korona gụnyere ịkwa ụkwara ma ọ dịghị ihe a na-akwapụta, umeọkụ, ahụọkụ, na ahụngbu. Korona na-arụkarị ọrụ ya megide usoro okuku-ume mmadụ. Ọtụtụ mgbe, korona anaghị edebe mmadụ n’ọnọdụ ọnwụ, mana ọ pụrụ ibute oke-oyi n’akpàikuku dị n’ime mmadụ, ma pụkwa ibute ọnwụ mbge ọnọdụ a dị oke njọ.

Onye ọbụla pụrụ inweta korona. Ndị ọ na-arụ ọrụ ọjọọ n’ahụ ha karịsịa bụ ndị agadi na ndị nwere ọrịa ọzọ, dịka ọrịa shuga, kansa ma ọ bụ ọrịa metụtara ikὺ ume.

Korona na-agbasa mgbe onye nwere ya kusara onye ọzọ ume, ma ọ bụ kwaa ụkwara ma ọ bụ zee uzere metụrụ nri ma ọ bụ ebe ọbụla onye ọzọ na-emetụ aka. N’ọnụ, n’imi, na n’anya ka korona si abanye n’ime ahụ mmadụ. Ọ banye n’ime ahụ, ọ malite mụbawa nakwa gbasawa n’akụkụ ahụ niile. Korona pụrụ ibi n’ime ahụ mmadụ ụbọchị iri-na-anọ tutu ihe na-egosi na ọrịa a bịala a pụtawa ihe. Nke a pụtara na ndị mmadụ nwere ike nwee korona, na-ekesakwa ya, ma ha amaghị na ha nwere ya.

E nweghịkwa ọgwụ na-egbu nje, ma ọ bụ ọgwụ ọbụla ị pụrụ ime n’ụlọ gị, ga-egbu korona. Nanị ụzọ e si egbochi korona bu ịkwọ aka ugboro ugboro na izere ịmetụ aka n’anya nakwa ikechi imi na ọnụ ebe korona si abanye n’ime ahụ.

Iji gbochie inweta korona, jiri ncha na-akwọ aka. Na-eme otu a, ọ bụrụgodị na ọ dị ka aka gị erughị unyi. Ka ị na-akwọ aka gị abụọ nke ọma n’okpuru mmiri na-agba agba, hụ na ị ghụchara okpuru mbọ aka niile. Iji ncha akwọ aka na-egbu nje vaịrọs aka gị nwetara. Kwọọ aka gị tutu isibe nri, mgbe i na-esi nri, nakwa mgbe i sichara nri. Kwọọ aka gị mgbe ị gachara ụlọ-mpochi. Kwọọ aka gị tutu iribe nri. Kwọọ aka gị mgbe i na-elekota onye nọ n’ọrịa, nakwa mgbe ị metụchara anụmanụ ma ọ bụ nsị anụmanụ aka. Kwọọ aka gị mbge ị kwachara ụkwara, mbge i zechara uzere, nakwa mgbe i zichara imi.
Tutu i metụ aka n’anya, n’imi ma ọ bụ n’onu, kwoo aka gi. Nihi na aka na-emetu ụtụtụ ebe, ọ pụrụ ịtụtụrụ nje vaịrọs n’ebe ndi ahụ. I metụ aka tụtụụrụ vaịrọs n’anya, n‘imi ma ọ bụ n’ọnụ, ma i bughị ụzọ kwọọ aka, vaịrọs ahụ ga-esi n’anya ma ọ bụ n‘imi ma ọ bụ n’ọnụ banye gị n’ime ahụ, butere gi ọrịa.. Ọ dị oke mkpa ka gị na onye ọbụla nwere ahụọkụ ma ọ bụ ụkwara, ma ọ bụ onye na adịghị eku ume nke ọma, ghara ịnọ nso. Were ubuaka ma ọ bụ mpempe tọịlet rolu kpuchie ọnụ ma ọ bụ imi mgbe ọbụla ị na-akwa ụkwara ma ọ bụ ѐzѐ uzere. Ozigbo i mechara nke a, tụba mpempe tọịlet rolu ijiri mee ya n’ihe nwere okwuchi e ji-ekpofu ahịhịa. A bụpụla asọ n’ebe ndị mmadụ nọ.

Nọrọ nzọụkwụ atọ (ya bụ otu mita, n’opekata mpe) site n’ebe onye ọbụla na-akwa ụkwara ma ọ bụ na-eze uzere nọ. A nọla nso onye ọbụla nwere ahụọkụ ma ọ bụ ụkwara.

E chefula ikpuchi imi na ọnụ nakwa ịna-akwọ aka ma ọ bụrụ na ị na-elekọta onye nwere ahụọkụ na ụkwara, onye iku ume na-esiri ike.

Ụzọ kacha nma isi gbochie korona bụ ịhụ na gị na mmadụ ọzọ emetụghị ahụ. Ị pụrụ inweta korona site n’ikwe mmadụ n’aka, mesịa bitụ aka n’anya, n‘imi ma ọ bụ n’ọnụ. Ya mere, kama ị ga-ekwe mmadụ n’aka, ma ọ bụ bie ya ọmà, ma ọ bụ susue ya ọnụ, jiri ife aka, ikwe n’isi ma ọ bụ ihulata isi kelee ya. Ọ bụrụ na i chere na korona nọ n’obodo ị nọ n’ime ya, nọrọ n’ụlọ, a pụtala ѐzi, ka i zeere imetụ ndị ọzọ ahụ.

Ọ bụrụ na i nwere obere isiọwụwa ma ọ bụ na imi na-ege gị ma ọ bụ na i chere na ahụ adịghị gị, nọrọ n’ụlọ rue mgbe ihe na-eme gị kwụsịrị. Ọ bụrụ na ị na-eze uzere, nwee ahụọkụ, iku ume na-esiri gị ike, nakwa ị na-akwa ụkwara mana e nweghị ihe ị na-akwapụta, e gbule oge ịga ụlọgwụ.

Nkwenye ụgha nakwa akụkọ a na amaghị ebe ọ malitere maka koronavaịrọs pụrụ ibute nnukwu ọghọm nakwa ọnwụ ndị mmadụ. Iji maa atụ, iṅụ mmanya-ọkụ ma ọ bụ mmiri-ọgwụ na-asachapụ mmanụ n’akwa ga-emerụ gị ahụ kama igbochi koronavaịrọs. Ihe ndị enyi gịna ikwu-na-ibe ga-agwa gị maka koronavaịrọs pụrụ ịbụ asị ma butekwa ọghọm. Na-agbaso nanị ihe ndị na-ahụ maka ahụike ọhaneze na-ekwu.

Ị ga-enye aka buso koronavaịrọs agha site n’ịgbasa ozi a. Biko gbalịa ka ozi a rute ezinụlọ na ndị enyi gị; ọ ga-akacha nma ma i jiri Wọzap mee nke a.

Ọ bụ Audiopedia wetara ozi a. Audiopedia bụ ije-ozi na-eme ka mmadụ niile nọ n’ụwa nụ ozi ahụike. Ga na www.audiopedia.org (n’igwe ọnya nwudude bụ Ịntanet) ka ị mata ihe ndị ọzọ maka Audiopedia